Ụlọọrụ MTN Ebunyela Gọọmenti Anambra Akụrụngwa Nlekọta Ahụike

Jan 20, 2022 - 21:49
 0
Ụlọọrụ MTN Ebunyela Gọọmenti Anambra Akụrụngwa Nlekọta Ahụike

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-adị mma onye ọrụ ugbo kọgide, kọgide, o menyere ndị nwe ala.

N'ịgbaso nke a, ụlọọrụ nzikọrịtaozi ekwentị, bụ ụlọọrụ MTN nọrọ na nsonso a wee bunye gọọmenti steeti Anambra akụrụngwa nlekọta ahụike a na-ebugharị ebugharị bụ Mobile Health Clinic n'aha bekee. 

Nke a bụ nke dabara adaba dịka otu n'ime ụzọ dị icheiche ụlọọrụ ahụ si akwàdo ma na-atụnye ụtụ n'ịkwàlite ezi ọnọdụ mmepe, ọganihu na ọdịmma gburugburu ebe ha nọ arụ ọrụ ha, bụ atụmatụ a maara dịka 'Corporate Social Responsibility'.

Mmemme inyefè akụrụngwa ahụ n'aka gọọmenti steeti Anambra bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti steeti ahụ dị n'Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ụfọdụ ndị ọrụ gọọmenti e ji okwu ha agba ìzú na ngalaba dị icheiche na steeti ahụ, tinyere ụfọdụ ndị ọrụ sitere ụlọọrụ ahụ, ndị bịara ịnọ hụ ka ya bụ ihe siri gaa.

N'okwu ya oge ọ na-enyefè akụrụngwa ahụ n'aka gọọmenti, onye ji ọkwa ‘Senior Manager, Sales and Trade Development, Core East’ n'ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Emmanuel Okereke, nke onye nọchitere anya ya bụ Maazị Collins Orji, kọwara na ebumnobi ha jii bute ya bụ akụrụngwa bụ iji kwàlite ezi nlekọta ahụike na mgbataọsọ, ọkachasị n'ihe metụtara ọnọdụ ahụike ụmụnwaanyị na ụmụaka n'okpuruọchịchị dị icheiche n'ime steeti ahụ.

O kwuru na Anambra so n'otu n'ime steeti isii soro wee rite uru na nkesà akụrụngwa ahụ, ma kwuo na ya bụ akụrụngwa bụkwa iji kelee ma kwàdó agbambọ gọọmenti n'ịkwalite ezi ọnọdụ ahụike nà usoro e si enwete ya, ọkachasị n'ime-ime obodo dị icheiche.

Oge ọ na-eme ka a mara na steeti ndị ọzọ soro kèta akụrụngwa ahụ gụnyèrè Lagos, Gombe, Kano, Kwara na Rivers; Maazị Okereke gàkwàrà n'ihu kọwaa na ha ga-akwàdo iji akụrụngwa ahụ rụọ ọrụ nlekọta ahụike, inyòchà mmadụ ahụ, inye ọgwụgwọ, inye ọgwụ, ịgbasa ozi na inye nkọwa maọbụ nkụzi banyere ụdị ọrịa dị icheiche, ma n'ahịa, ma n'ime-ime obodo dị icheihe, wee ruo ọnwa iri na abụọ (otu ahọ) zuru èzù.

Na nzaghachi ya oge ọ na-anabata akụrụngwa ahụ n'aha gọọmenti steeti ahụ, odeakwụkwọ izugbe steeti Anambra, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu kèlèrè ụlọọrụ ahụ maka ịhụta na ịghọta mkpà ọ dị ịkwàdò na inyere gọọmenti aka n'ihe gbasaara iwulite ezi ọnọdụ ahụike.

O kwuru na gọọmenti Anambra ejighị ihe gbasaara ọdịmma nà ọnọdụ ahụike ụmụafọ ya egwù egwu, bụkwa nke mere o jiri tie mà ká na-etikwa ọtụtụ ịgba na-ada ụda na ngalaba ahụike na ngalaba ndị ọzọ dị icheiche na steeti ahụ. Ọ kpọkukwàzịrị ụlọọrụ ndị ọzọ dị icheiche ka ha ñòmie ihe ahụ ụlọọrụ ahụ mere.

Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ahụike n'ime steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Okpala gbàrà akaebe ya na nke ahụ bụ àgbà nke ugboro atọ ya ụlọọrụ ahụ na-eme ihe dị etu ahụ; ma kwupụtakwa hoohaa na steeti ahụ nwèrè obiañụrị banyere mmekọrịta ya na ụlọọrụ ahụ. O kwùkwàrà na a ga-elekọta ma tinye akụrụngwa ahụ n'ọrụ nke ọma, jiri ya rụọ ọrụ ebe kwesiri ekwesi nàkwà mgbe kwesiri ekwesi, dịka a tụrụ anya.

Ha nọkwazịrị ebe ahụ ụbọchị ahụ wee gagharịa gburugburu akụrụngwa ahụ, ma bàkwa n'ime ya, iji hụ ihe ụfọdụ pụrụ iche dịgasị na ya, nàkwà etu o si arụ ọrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484