Ụlọụka 'Anglican Church of Redemption' Akaala Ụka Owuwe Ihe Ubi na Ịtụ Mmamma

Dec 3, 2021 - 22:58
Dec 3, 2021 - 23:01
 0
Ụlọụka 'Anglican Church of Redemption' Akaala Ụka Owuwe Ihe Ubi na Ịtụ Mmamma


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-adị mma mmadụ gụrụ gụrụ gụrụ, o kelee ihe na-ejere ya ozi na ihe ọ na-ejere ozi.

N'ịgbasò nke a, ndị ụka 'Anglican Church of Redemption' dị n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra  nọrọ ụbọchị ụka gara aga wee jiri ọñụ na ite egwu ọñụ wee bịa n'ihu Chineke ịtụrụ ya mmamma maka onyinye ndụ, ezi ahụike na ihe ndị ọzọ O jirii gọzie ha.

N'okwuchukwu ya n'ofufenro ahụ, Ụkọchukwu Prince Chukwuma Oranye nke gbàdòrò ụkwụ n'akwụkwọ Ọpụpụ 35:5 na n'Ọlụ Ndị Ozi 11:25-30 wee kọwaa na e nwere ngalaba nkụzi onyinye abụọ n'akwụkwọ nsọ —nke a hụtara n'àgbà ochie na nke a hụtara n'àgbà ọhụrụ; ma kọwakwa na onyinye bụ ihe nke mmụọ na usoro e si enweta ngọzị na ihuọma site n'aka Chineke.

Dịka ọ na-akọwa onyinye dịka ụzọ e sikwa egosipụta ịhụnanya, ọ gbàdòrò ụkwụ n'Abụ Ọma 103:1-6 wee kpọpụtasịa ihe dị icheiche mmadụ kwesiri ilekwàsị anya wee na-enye Chineke onyinye ma na-ekelekwa Ya ekele oge niile. Ọ kpọkukwazịrị onye ọbụla ka o jiri obi ya niile wee na-enye Chineke ekele na onyinye ọbụla ọ na-enye Ya, n'ihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ha niile were enye n'anya. Ọ dụkwara ndị bịara ofufenro ahụ ọdụ ka ha buru ụzọ nye ma chee onwe ha n'ihu Chineke, tupu onyinye ha, ka Chineke wee nabata ya.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisioche mmemme ahụ, bụ Ọkammụta Sidney Onyeagụ tụwàrà isiokwu nke mmemme ahụ, nke bụ 'Onyinye Nke Mweghàchi Si n'Igwe' (Harvest of Divine Restoration), ma kọpụtakwa akụkọ ọgbụgba ama ihe ebube dị icheiche Chineke mere na ndụ ya n'ihi ụdị onyinye ịtụmmamma ahụ, ya na ọkpụrụkpụ ego e nweteresiri, ọkachasị n'ime ahọ dị icheiche Chineke jigoro ya kwara ngwaọrụ dịka onyeisioche mmemme ahụ. 

Ka ọ na-agba ha ume ka ha nyekwa Chineke ihe gbara ọkpụrụkpụ n'ime ahọ a karịa ka ha nyere n'ahọ ndị gara aga; ọ gwakwazịrị onye ọbụla na-abịa onyinye ahụ ka o jiri okwukwe na ezi ntụkwasịobi wee chee onwe ya na onyinye ya n'ihu Chineke, n'ihi Chineke pụrụ ime ihe niile.

A nọrọ ụbọchị ahụ wee nwee onyinye na ịtụ mmamma site n'aka ndị òtù na ezinụlọ dị icheiche, bụkwa nke ha jiri oke ọñụ na ite egwu ọñụ wee mee. A nọkwara na mmemme ahụ wee bụọ abụ pụrụ iche na abụ otuto dị icheiche site n'aka ndị ọbụabụ ụlọụka ahụ, kpee usoro ekpere dị icheiche, waa achịcha bekee, gbàá ọnya ego, ma gbanwèsikwa ihe dị icheiche e jiri bịa onyinye ụbọchị ahụ n'ego maka nkwàlite oziọma.

N'okwu ha n'otu n'otu, onyeisi nchụaja n'ụlọụka ahụ, bụ Venerebụụ Obiora Alokwu, na onyeisioche òtù ọrụ haziri maka onyinye ahụ, bụ Maazị Henry Opara kèlèrè Chineke etu ya bụ mmemme siri gaa nke ọma na n'ụzọ dara ụda, ma kelekwa ndị dị icheiche nyere aka n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ ịhụ na ya bụ oke ụbọchị gara nke ọma karịa ka a tụrụ anya. Ha kpekwara ka Chineke gọzie ma kwụghachi onye ọbụla sonyere n'onyinye ahụ mmaji kwuru mmaji.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484