Ụmụakwụkwọ Unizik Arịọla Njikọaka Ụlọọrụ ANPC Maka Asọmpi 'Hult Prize' Ha Na-Achịkọba

Nov 25, 2020 - 16:14
Jan 30, 2021 - 16:15
 0
Ụmụakwụkwọ Unizik Arịọla Njikọaka Ụlọọrụ ANPC Maka Asọmpi 'Hult Prize' Ha Na-Achịkọba

Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-abụ ọkọ kọba mmadụ, o jekwuru ibe ya, mana ọ kọba anụmanụ, ọ chọba ukwu osisi.

Ka ọ dị taa, ụmụakwụkwọ na-ahazi asọmpi 'Hult Prize' na mahadum Nnamdị Azikiwe (Unizik) dị n'Awka, n'ime steeti Anambra akpọtụrụla ụlọọrụ 'Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)' ma rịọ njikọaka ya n'ịgbasa ozi banyere asọmpi ahụ nke ahọ a.

Onyeisi òtù nhazi asọmpi ahụ a maara dịka 'Hult Prize Foundation' na mahadum Unizik, bụ Maazị Ava Somtoochukwu bụ ya kwupụtara nke a oge ọ bịara kpọtụrụ onyeisi ANPC ahụ bụ Maazị Chuka Nnabuife n'isi ụlọọrụ ahụ dị n'Awka. 

O mere ka a mara na asọmpi ahụ bụ nke ga-ewere ọnọdụ ụbọchị Satọdee izuụka a n'ogige 'Chike Okoli Centre for Entrepreneurship Studies' dị n'ime mahadum ahụ, ma mee ka a mara na ya bụ asọmpi bụ maka ụmụakwụkwọ mahadum Unizik, ma kwuo na ndị tuuru ugo na ya ga-agbago n'ogoogo nke mpaghara ndịda ọwụwa anwanyụ. 

Ọ sị na asọmpi ahụ bụ asọmpi ụmụakwụkwọ n'ogoogo mba ụwa, nke ọ bụ onye chịrị mba US n'oge mbụ, bụ Bill Clinton na-akwàdo ya, ma kwuo na onye ọbụla tuuru ugo na ya n'ogoogo mba ụwa ego nrite dị otu nde dọlà ($1m).

Ọ rịọzịrị njikọaka ụlọọrụ ANPC maka njikọaka ha n'ịgbasa ozi banyere ya bụ asọmpi ahụ, iji mee ka ụmụakwụkwọ mahadum ahụ mee nke ọma ma ruo n'ogoogo ikpeazụ na steeti ahụ. 

Na nzaghachi, onyeisi ụlọọrụ ANPC bụ Maazị Chuka Nnabuife nabàtàrà nwa amadi ahụ na ebumnobi o jiri bịa. O mere ka a mara na ụlọọrụ ahụ bụ ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ 'National Light Newspaper', Ka Ọ Dị Taa, na 'Sportslight Xtra', tinyere ọtụtụ ihe dị iche iche ụlọọrụ ahụ na-eme.

Ọ kọwara na ụlọọrụ ahụ bụ ọkaibe n'ịgbasa ozi, ma bụrụkwa ụlọọrụ na-akwado ụmụakwụkwọ na ndị ntorobịa ọbụla nwere ezi ebumnobi ha na-achụso. O kwezịrị nkwà na ha na ụlọọrụ ahụ ga-ejikọ aka ọnụ, dịka ha siri rịọ, ma gbasakwara ha ozi banyere asọmpi ahụ, ma tupu e bido ya, mgbe a na-eme ya, na mgbe e mechara ya.

Maazị Somtoochukwu nọkwazịrị na njem mkpọtụrụ ahụ wee nye ụlọọrụ ANPC onyinye nkwanye ùgwù maka njikọaka ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.