Ụmụnwaanyị 'Anglican Church of Redemption' Emeela Nnukwu Ọgbakọ Mbụ Dịka Parish

Sep 22, 2021 - 20:05
 0
Ụmụnwaanyị 'Anglican Church of Redemption' Emeela Nnukwu Ọgbakọ Mbụ Dịka Parish

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ka ọ gachara ihe dịka izuụka atọ Ashbishọọpụ mpaghara Niger na Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka, bụ Ashbishọọpụ Alexander Ibezim jiri bulichaa mpaghara Temp. Site nke ụlọụka 'Chapel of Redemption' nke Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka ka ọ bụrụzie Parish, ma nyekwazie ụlọụka ahụ aha ọhụrụ dịka 'Anglican Church of Redemption'; ụmụnwaanyị ụlọụka ahụ enweela nnukwu ọgbakọ mbụ ha n'ogoogo ọhụrụ ha dịka ụmụnwaanyị Parish. 

Nnukwu ọgbakọ ahụ isiokwu ya bụ “Aha Jehova bụ ụlọelu e wusiri ike, ndị ezi omume na-agbabà n'ime ya ma nwee nchekwa”, bụ nke weere ọnọdụ na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke e jiri ofufènrò oriri nsọ na ọmụmụ akwụkwọnsọ wee malite. Ya bụ mmemme dọtàkwàrà ọtụtụ ụmụnwaanyị ụlọụka ahụ, bụkwa ndị yiri ákwà òtù ha dị icheiche wee bịa, bụkwa nke mbụ na mbụ ha na-eyi akwa òtù ha dị icheiche were abịa ọgbakọ ahụ n'ụlọụka ahụ.

N'ozi pụrụ iche ọ gụpụtara n'ọgbakọ ahụ, onye ndu ụmụnwaanyị ahụ, ma bụrụkwa nwunye onyeisi nchụaja ụlọụka ahụ, bụ Nneọra Stella Alokwu kelere Chineke maka ịdịmma Ya, ebere Ya, nchekwa Ya na mbulielu Ya n'isi ụmụ Ya na n'ụlọụka ahụ, ọbụladị ma n'oge ahụ ọrịa COVID-19 na-akpa ajọ ike ma na-ebìkwa ụmụmmadụ na ụlọụka dị icheiche aka ọjọọ. 

O kelekwara ndị ndu ụlọụka ahụ ma n'ogoogo ụlọụka, n'ogoogo parish, n'ogoogo Ashdikinri, na n'ogoogo dayọsiisi, maka ezi ndu ha nà etu Chineke siri jiri ha na-akwara ngwaọrụ n'ilekọta igwè atụrụ Ya na ịkwadobe ha maka alaeze; ọbụladị dịka o kpere ka Chineke gaa n'ihu ịbawanye otitemmanụ ha, ịgọzi ije ozi ha, na ime ka amara Ya baara ha ụba.

Ọ kpọpụtasịrị mmemme na ihe ndị  ihe dị icheiche weere ọnọdụ n'ụlọụka ahụ na dayọsiisi ahụ n'ime ahọ a, nke gụnyere ibuli ụlọụka ahụ n'ogoogo parish, ụka nne, iguzobe òtù ụmụnwaanyị ọhụrụ a maara dịka òtù 'Young Wives', nnabàta n'òtù ụmụnwaanyị na òtù ụmụagbọghọ, nnukwu ọgbakọ ụmụnwaanyị dayọsiisi ahụ a kpọrọ 'Awka Diocesan Women Conference' (ADWOC), ọgbakọ sinọọdụ dayọsiisi ahụ, tinyere ụfọdụ mmemme ndị ọzọ, bụkwa ndị ọ gbara akaebe ma nye Chineke ekele na ha gara nke ọma.

O kwuru na ihe ọñụ na ihe akụkọ ọgbụgbaama mèèrè ọtụtụ ụmụnwaanyị n'ime ndị òtù ha n'ime ahọ a, ma ndị gara ọmụgwọ, ndị mụrụ nwa ọhụrụ, ndị nwetara asambodo mmụta dị elu, ndị e buliri n'ọkwa na ndị ọzọ ihe ọma dị icheiche meere; ọbụladị dịka ọ kasikwara ndị dị icheiche mmadụ nwụnahịrị obi, ma kpee ka Chineke nye ha nkasi nke ọmụọ.

N'ajụjụọnụ a gbara ya, otu onye n'ime ụmụnwaanyị ahụ sónyéré n'ọgbakọ ahụ, bụ 'Dame' Irene John-Ifejika kelere maka etu ya bụ mmemme siri gaa nke ọma, kọwaa Nneọra Alokwu dịka onye jupụtara na Mmụọ Nsọ n'ihi etu o siri hazie mmemme ahụ, ọbụladị dịka ọ dụrụ ụmụnwaanyị ibe ya ọdụ ka ha lekwasị Chineke anya oge niile site n'iji Ya mere ebe mgbaba e wusiri ike, dịka isiokwu mmemme ahụ siri kwuo, karịa ịtụkwasị obi n'ihe ọzọ.

Na mbụ n'okwu ya onyeisi nchụaja ụlọụka ahụ, bụ Ven. Dkt. Obiorah Alokwu kelere ụmụnwaanyị ahụ maka ịpụta n'ìgwè wee sonye na mmemme ahụ, ma gbàá ha ume ka ha na-enwe mmasị oge nille n'ihe nke Chukwu ma na-etinyekwa ntụkwasịobi ha na Ya oge niile.

A nọrọ na mmemme ahụ kpee usoro ekpere dị icheiche, gụọ ozi pụrụ iche site n'aka onyeisi ụmụnwaanyị ahụ, waa achịcha bekee, mee asọmpi ajụọazaa sitere n'akwụkwọnsọ, tụọ mmamma, gbaa egwu ma mekwa ihe ngosi ndị ọzọ dị icheiche site n'aka ụmụnwaanyị ahụ, nke mere ka ya bụ mmemme dàá ụdà nke ukwuu ma bụrụkwa ejiamaatụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484