Uwa nke a sefu!

Apr 18, 2013 - 06:00
Jan 22, 2021 - 05:26
 0
Uwa nke a sefu!

Abraham Madu, USA

Eeekwa! Mberede nyịrị dike. Ọ bụkwa mberede ka e ji amata nwa dike. Ọ bụ ihe nwute na ụmụ mmadụ bịara ịgba ọsọ maratọnụ, na ndị bịara ikiri ha ka ndị omekaome lara ndụ ha n’iyi site n’ịgba ogbunigwe n’abọ nke merụrụ ọtụtụ ụmụ mmadụ ahụ.

Ụwa nke a dịkwa egwu. Ụmụ mmadụ ọgazị akpọchibido onwe ha ụzọ ka enwe na adaka a kpọchiri na zuu (Zoo)? Keduzị nke bụ na ụmụ mmadụ agaghịzịkwa agbakọ ịnara ikuku? Kedụzị nke na ụmụ mmadụ agaghịzịkwa apụta nyara anwụ ghara ịna achịrị mkpụrụ obi ha n’aka? Kedụzị nke na ụmụ mmadụ agaghịzịkwa aṅụ miri tọgbọ iko n’ụwa nke a ugbu a? Keduzị nke na ụmụ mmadụ apụghịzịkwa ịgbakọ ghara ịna ele anya n’azụ ukombụ ha, ịmata ma ọ dị ndị pa egbe ịgba ha?

Ụdịka ndụ gịnị bụzị ndụ ndịa anyị nazịkwa ebi na mmadụ ahụghịzịkwa mmadụ ibe ya n’anya cha cha! Ụwa nke a sefụ! Ụwa enweghị isi, nke o ji enwe ọdụ cha cha!

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.