Whitney Houston anwuola

Whitney Houston anwuola

Nov 15, 2011 - 06:04
Jan 20, 2021 - 06:04
 0
Whitney Houston anwuola

Otu nwanyị olu ọma, onye Amerịka, a ma ama maka ịgụ egwu, bụ Whitney Houston, anwụọla. E butere ozu Whitney n’ime ụlọ oriri n’ọñụñụ Beverly Hilton.

A ma Whitney ama maka olu ọma ya. Ọ gbara afọ 48 tupu ọnwụ egbuo ya. Tupu ọ nwụọ, ọ gara na mpaghara Hollywood ebe a na-eme mmemme nturu ugo Grammy. Grammy bụ otu n’ime mmemme ndị a na-eji etuwe ndị aka ha pụtara ihe n’ịkụ egwu ugo.

A na-ekwu na a hụrụ Whiteney anya ịkpazụ n’ụbọchị Tọzdee mgbe ọ gụchara nwa obere egwu n’ebe ahụ a na-eme mmemme Grammy. A hụkwara ya anya ọzọ na mgbede Fraịdee ebe ya na ndị enyi ya na-enwe añụrị n’ụlọ oriri n’ọñụñụ Beverly Hilton.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.