Otu onye ọkaikpe na mba Amerịka atụọla nwa afọ ala Nigeria nga mkpụrụ. Dịka a na-ewere otu ogbe ọka na-atụpụ nanị otu mkpụrụ ọka nay a kwa afọ, nga mkpụrụ ọka bụ nga ebighi ebi, nke onye a tụrụ ya ga-anọgide n’ime ya were ruo n’ụbọchị ọnwụ ya.
Gịnị kpatara e jiri tụọ ya ụdị nga a? Umar kwetere na ikpe mara ya n’ebubo ahụ eboro ya na ọ kpara nkata ma nwakwaa ike ya ịtụ ogbunigwe n’ụgbọelu bu ndị njem aga Amerịka.
N’ụbọchị ekeresimesi, abalị 25 nke ọnwa disemba, afọ 2009, Umar kwara mgbọ ogbunigwe yiri ya n’iba ya, were banye n’ụgbọelu na-aga Amerika. A na-akọwa na ndị otu Al-Kaịda koro Umar. O kwenyere ha were nyiri ogbunigwe n’iba ya were banye n’ugboelu bu ihe ruru mmadụ 300 si Amsterdam aga Detroit. Mgbe ha ruteweziri n’ebe ụgbọelu ha ga-ada n’Amerịka. Umar nwara ike ya ime ka obugbigwe ya gbawaa, ma gbuo ma ya ma ndị ọzọ so eme njem n’ụgbọelu ahụ. Mana aka apụghị ya.
Ị sị na ịmaghị ihe dị iche na ọnwụ na ndụ? Enwele mụ ọlụ ihe mụ ga ede, HO! HA! Ka mụ kọwara ndị na amaghị ihe dị iche banyere ọnwụ na ndụ, HO! HA!
Onye nwụrụ anwụ anaghị eto Chukwu! Onye dị ndụ na-eto Chineke JAA! Onye dị ndụ na-eku ume. Onye nwụrụ anwụ anaghị eku ume cha cha. Onye dị ndụ na-enye mmadụ oke nsogbu. Onye nwụrụ anwụ nsogbu ọ na-enye ndị dị ndụ bụ ka ha ga-esi lie ya, ebe ọ bụ na onye nwụrụ anwụ apụghị ili onwe ya, karịkwa ndị dị ndụ ga eli ya, HO! HA!
Mba Zambịa enwena mmeri n’asọmụmpi bọọlụ ụkwụ na Libreville. Zambịa meriri mba Kotovua taa, were turu ugo dịka eze egwuregwu bọọlụ na mba Afrịka.
Otu egwuregwu bọọlụ Chipolopolos nke Zambịa meriri ndị otu Elephant (Enyi) nke Kotovua.
Ka a gbachara bọọlụ taa, ndị otu abụọ ndị a gbara onye lawa onye lawa. Mgbe a batazịrị n’asọmụmpi nke onye dere o gbaa, nke a kpọrọ penariti, ndị Zambịa nyere goolu 8, ebe ndị Kotovua nyetere goolu 7.
Nke a bụ izizi ndị Zambịa na-ebute iko mba Afrịka a kemgbe afọ 1957 a malitere zọwa iko a.
Ndị uwe ojii enwetego Kabiru Sokoro, otu onye otu Boko Haram a na-abo ebubo na o soro kpaa nkata maka ogbunigwe ahụ a tụrụ n’ụlọ ụka na Madalla n’ụbọchị ekeresimesi.
Ndị uwe ojii jidere onye omekome a n’Abuja n’ọnwa Jenụwarị. Mana o mechara megharịa ha anya were gbalaaha ndị uwe ojii, were dapuo ala kemgbe ahụ.
A na-achọzị Kabiru Sokoto mbi aka mbi aka kemgbe ahụ. Ndị ọrụ nchekwa mechara maa ọkwa si na a ga-enye onye ọbụla nwudere Kabiru akatamkpo ego ruru nde naira 50.
Ozi anyị siri n’aka ndị ụlọ mgbasa ozi MSNBC nwete na-akọwa na Rick Santorum enwela mmeri na ntụli aka nke okpuru ụlọ ndị otu ndọrondọrọ ọchịchị Rịpọblikan e mere ụnya na steeti atọ ndị a: Colorado, Minnesota na Misouri.
Kemgbe ọnwa ole n’ole ka ndị Rịpọblikan na-eme ntụli aka maka ihọpụta onye otu ha ga-amara onye isi ala Amerịka bụ Barack Obama aka mgba na ntụli aka nke a ga-eme n’ọnwa Nọvemba afọ a maka ịhọpụta onye isi ala Amerịka.
Na ntụli aka nke a e mere ụnya na steeti atọ, lee ka okwe siri gba:
Ịgba ụzọ abụghị sọsọ ụzọ ụtụtụ, HO! HA! Igbo bụ Igbo na-asị n’anụ gbara ụzọ ụtụtụ na-eri azụ ukpo, kpọm kwem! Nke a bụ ma a na-ekwu sọsọ maka n’ala Igbo na gbo gbo. Oge ugbu a ọkụ electirisiti na-eme a maghị kwa mgbe bụ ehihie na mgbe bụ abalị, ụmụ mmadụ na-eje kwa ọlụ n’oge dị iche iche.
Ndị na-aga ọlụ ụtụtụ ka na-agakwa, ndị na-aga ọlụ n’ehihie ka na-agakwa, ndị nakwa aga ọlụ abalị ka na-agakwa. Mgbe onye ji teta bụ ụtụtụ ya, HO! HA!
Ọ dị mkpa ka anyị kulie ọsịsọ/ngwa ngwa were kwadobe ebe ọbụla anyị chọrọ ije ka anyị ghara ime leeti, HO! HA! Mgbe ọbụla mmadụ ebilitaghị n’oge, ma ọ bụ na ọ malitaghị n’oge kwadobe ije, ala na-akpọlarị ya na nkụ, kpọm kwem!
Ịkwado n’oge were eme ihe amaka. Ọ na-eme ka mmadụ kudata ume were kwado akwado. Hụrụ hụrụ adịghị mgbe mmadụ kuliri n’oge were na-akwado njem. Ọ na-ekutu ahụ were kwadochasịa. Nke a na-eme na ọ naghị echefu ọtụtụ ihe okwesiri iji were ga ya bụ njem.
Ozi siri n’aka ndị ụlọ ọrụ Voice of Nigeria biara anyị na-ekwu n’otu ụlọ ikpe na Lagos amago Hamza Al-Mustapha ikpe ọnwụ. Major Al-Mustapha jibu ọkwa onye isi ngalaba nchekwa n’oge Sani Abacha na-achị ala Nigeria.
Kemgbe ihe karịrị afọ 12 ka a na-ekpe Mustapha na ndị otu ya ikpe. E boro ha ebubo na ha gburu nwaada Kudirat Abiola, ori akụ Moshood Abiola, nwoke onye Yoruba nwetere mmeri na ntụli aka nke e ji ahọpụta onye isi ala, nke e mere na Nigeria n’abalị 12 nke ọnwa Juunu afọ 1993.
Otu nwanyị olu ọma, onye Amerịka, a ma ama maka ịgụ egwu, bụ Whitney Houston, anwụọla. E butere ozu Whitney n’ime ụlọ oriri n’ọñụñụ Beverly Hilton.
A ma Whitney ama maka olu ọma ya. Ọ gbara afọ 48 tupu ọnwụ egbuo ya. Tupu ọ nwụọ, ọ gara na mpaghara Hollywood ebe a na-eme mmemme nturu ugo Grammy. Grammy bụ otu n’ime mmemme ndị a na-eji etuwe ndị aka ha pụtara ihe n’ịkụ egwu ugo.
A na-ekwu na a hụrụ Whiteney anya ịkpazụ n’ụbọchị Tọzdee mgbe ọ gụchara nwa obere egwu n’ebe ahụ a na-eme mmemme Grammy. A hụkwara ya anya ọzọ na mgbede Fraịdee ebe ya na ndị enyi ya na-enwe añụrị n’ụlọ oriri n’ọñụñụ Beverly Hilton.
Igbo mara na a na-achọ mmadụ a gaba ebe a mụrụ ya. Nke a bụ maka na ọsọ chụba nwata ọ gbala n’ụlọ ebe a mụrụ ya. Ugbu a kwanụ Igbo ahụbeghị Eze Igbo gburu gburu, ọ bụ ihe kwesiri ekwesi n’omenala Igbo ịchọ ya bụ oke mmadụ lawa obodo Zungeru, ebe a mụrụ ya.
Ọ bụrụ na a hụghị ya n’ebe ahụ, ọ kwa ihe kwesiri ekwesi ka a chọrọ ya jebe obodo ọgbagara ọsọ mgbe ndị iro gbara ya gburu gburu n’obodo Biafra. Ụmụ Igbo ga-ejerịrị obodo abụa ndị a ịmata ma a ga-ahụ ya.
Iwu bụ na ebe ọ bụla nwata na-ebe akwa arụ aka, nne ya anọghị ya, mara na nna ya nọ ya. Ndị obodo abụa ndị a ga-amarịrị ebe ọ nọ, ma ọ bụ ihe mere ya, HO! HA! Igbo tụrụ ilu sị na onye ihe ya furu chọba ya ọ ga-achọta ya, kpọm kwem!
Ụmụ Igbo bụ Igbo ibe mụ! Ọ pụtara na ọ dịghị ihe anyị bụ ụmụ Igbo nwere ike kwerịkọta were ofu obi me ya? Ihe gbasara Dim Chukwuemeka Ọdụmụegwu Ojukwu kwesiri ịdị iche. O kwesiri ịbụ ofu ihe ga-eme ụmụ Igbo agba mbọ tụkọta eluo ọnụ were obi nwa nne hazie ma mezie akwamụ ozu nke a metụtara Igbo nile.
Ọ bụrụ ọgwụ ọ ma rere ndị gwọrọ ya kọ ụmụ Igbo. Ndị kwe ndị ekweghị. Ọ bụrọzị Igbo tụrụ ilu sị na a nyụkọ amịrị ọnụ ọ gbọ ụfụfụ? Ewu tara ahụ, nwanne na nwanne na-abọ ya.